6 A ga-ala ma obodo niile unu bi ma ebe niile unu bi n’iyi.+ A ga-akwadakwa ebe ndị dị elu dị n’obodo unu. Ha ga-atọgbọrọkwa nkịtị.+ A ga-akwadakwa ebe ịchụàjà unu, kụrisịakwa ha. Arụsị unu niile na-asọ oyi ga-alakwa n’iyi. A ga-agbajisịkwa ihe unu ji adọsa insens, bibiekwa ihe unu ji aka unu rụọ.