-
Ezikiel 12:3Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
3 Ma gịnwa, bụ́ nwa nke mmadụ, kwakọta ngwongwo ị ga-ebu pụọ ka onye a dọọrọ n’agha. Ị kwakọtachaa ya, ka ha na-ele ihe ị na-eme, buru ya pụọ n’ehihie ka onye a dọọrọ n’agha. Ka ha nọkwa na-ele ihe ị na-eme, si n’obodo gị kwapụ kwaga obodo ọzọ ka onye a dọọrọ n’agha. Ha nwere ike ịghọta ihe ị na-eme, ọ bụ eziokwu na ha bụ ndị nnupụisi.
-