22 Ma, a ga-enwe ụfọdụ ndị a na-agaghị egbu. A ga-akpọpụtakwa+ ma ha ma ụmụ ha ndị nwoke ma ụmụ ha ndị nwaanyị. Ha ga-abịakwute unu. Ọ bụrụkwa na unu ahụ àgwà ha na omume ha, obi ga-esi unu ike na ọdachi m mere ka ọ dakwasị Jeruselem, ya bụ, ihe niile m mere ya, kwesịrị ekwesị.’”