12 Ndị bi n’ime gị na-ana aka azụ* iji gbuo mmadụ.*+ Ha na-agbazinye mmadụ ihe ka ha nata ya ọmụrụ nwa+ ma ọ bụ ka ha rite uru. Ha na-egwukwa ndị agbata obi ha wayo.+ N’eziokwu, unu echefuola m kpamkpam.’ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.