24 Ha na ìgwè ndị agha ga-eji ụgbọ ịnyịnya agha ndị ụkwụ ha na-eme mkpọtụ bata lụso gị agha. Ha ga-ejikwa ọta ukwu na ọta nta na okpu agha. Ha ga-agba gị gburugburu lụso gị agha. M ga-enyekwa ha ikike ka ha kpee gị ikpe. Ha ga-ekpekwa gị ikpe otú masịrị ha.+