23 Ha agaghịzi eji arụsị ha dị iche iche na-asọ oyi na arụ ndị ha na-akpa nakwa mmehie ha niile merụọ onwe ha.+ M ga-enyere ha aka ka ha kwụsị mmehie niile ha nọ na-eme mgbe ha kwụsịrị irubere m isi. M ga-emekwa ka ha dị ọcha. Ha ga-abụ ndị m, mụnwa ga-abụkwa Chineke ha.+