5 Jehova gwaziri m, sị: “Nwa nke mmadụ, anya ruo gị ala, na-ele anya, geekwa ntị nke ọma nụrụ ihe niile m na-agwa gị banyere iwu na ntụziaka ndị gbasara ụlọ Jehova. Ebe ị ga-aka eleru anya ala bụ n’ọnụ ụzọ e si abanye n’ụlọ nsọ nakwa n’ọnụ ụzọ niile e si apụ na ya.+