18 “‘Ọ bụ ihe a bụ nrọ mụnwa bụ́ Eze Nebukadneza rọrọ. Ugbu a, Belteshaza, kọwaara m ya n’ihi na ndị niile ọzọ ma ihe n’alaeze m enweghị ike ịkọwara m ihe ọ pụtara.+ Ma i nwere ike ịkọwa ya, n’ihi na mmụọ nke chi dị iche iche dị nsọ na-akpa ike n’ime gị.’