-
Daniel 5:11Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
11 E nwere otu nwoke nọ n’alaeze gị nke mmụọ chi dị iche iche dị nsọ na-akpa ike n’ahụ́ ya. Mgbe nna gị* na-achị, a chọpụtara na nwoke a nwere ọgụgụ isi, na-aghọta ihe, marakwa ihe ka chi dị iche iche.+ Eze Nebukadneza bụ́ nna gị* mere ya onyeisi ndị dibịa anwansi, ndị dibịa afa, ndị Kaldia,* na onyeisi ndị na-eji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu.+ Eze, ọ bụ ihe nna gị* mere.
-