19 N’ihi otú Chineke si mee ka ọ bụrụ onye ukwu, ndị niile, ndị si ná mba dị iche iche, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche tụrụ ya egwu.+ Ọ na-egbu onye ọ bụla ọ chọrọ igbu, hapụkwa onye ọ bụla ọ chọrọ ịhapụ ndụ. Ọ na-ebuli onye ọ bụla masịrị ya n’ọkwá, wedakwa onye ọ bụla masịrị ya ala.+