-
Daniel 5:23Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
23 Kama i buliri onwe gị elu wee nupụrụ Onyenwe eluigwe isi,+ i nyekwara iwu ka a chịpụtara gị arịa ndị si n’ụlọ ya.+ Gị na ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị gị na ndị iko gị nwaanyị na ndị nwunye gị ndị ọzọ wee jiri ha ṅụọ mmanya. Unu tokwara chi ndị e ji ọlaọcha na ọlaedo, ọla kọpa, na ígwè kpụọ, chi ndị e ji osisi pịa, nakwa chi ndị e ji nkume tụọ, ya bụ, chi ndị na-anaghị ahụ ụzọ, ndị na-anaghị anụ ihe, ndị na-amaghịkwa ihe.+ Ma i toghị Chineke onye ndụ gị na ihe niile ị na-eme dị n’aka.+
-