4 N’oge ahụ, ndị ahụ so ná ndị isi nakwa ndị setrap nọ na-achọ ihe ha ga-ebo Daniel na o mere n’alaeze ahụ. Ma e nweghị ihe ọ bụla ha hụrụ ha ga-ebo ya, e nweghịkwa ihe ọjọọ ọ bụla ha ga-asị na o mere n’ihi na ọ na-akwụwa aka ọtọ. Ọ naghị eleghara ọrụ ya anya, ọ naghịkwa arụrụ aka.