7 Ụbọchị a ga-elebara ha anya ga-abịa.+
Ụbọchị a ga-akwụ ha ụgwọ ihe ha metara ga-abịa.
Ndị Izrel ga-ama ihe na-emenụ.
Onye amụma ha ga-aghọ onye nzuzu, ara agbaakwa onye na-ekwu na Chineke gwara ya okwu.
Ndị iro unu dị ọtụtụ n’ihi na mmehie unu dị ọtụtụ.”