2 O wee jụọ m, sị: “Gịnị ka ị na-ahụ?”
M wee sị ya: “M na-ahụ ihe e ji adọsa ọkụ. Ọ bụ naanị ọlaedo ka e ji rụọ ya,+ otu efere dịkwa n’elu ya. Ọkụ asaa dị na ya.+ N’eziokwu, ha dị asaa. Ọkụ ndị ahụ dị n’elu ya nwekwara okporo asaa mmanụ ọkụ si abanye na ha.