6 N’ụbọchị ahụ, m ga-eme ka ndị isi Juda dị ka ite na-ere ọkụ n’ọhịa, meekwa ka ha dị ka ọwa ọkụ e sonyere n’ùkwù ọka.*+ Ha ga-erepịa ndị niile gbara ha gburugburu n’aka nri nakwa n’aka ekpe.+ Ndị Jeruselem ga-ebikwa n’obodo ha,* ya bụ, na Jeruselem.+