11 “N’ihi na malite n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo n’ebe ọdịda anyanwụ, a ga-asọpụrụ aha m ná mba niile.+ A ga na-achụ àjà n’ebe niile, a ga na-ewetakwa onyinye iji too aha m, bụ́ onyinye dị ọcha; n’ihi na a ga-asọpụrụ aha m ná mba niile.”+ Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.