13 Unu na-asịkwa, ‘Ike ya agwụla anyị.’ Unu na-emikwara ya ọnụ.” Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru. “Unu na-ewetakwa anụmanụ ndị e zuru ezu, ndị dara ngwọrọ, na ndị na-arịa ọrịa. N’eziokwu, unu na-enye ha n’onyinye. M̀ kwesịrị ịnara unu ha?”+ Ọ bụ ihe Jehova kwuru.