17 “Ihe unu na-ekwu emeela ka ike unu gwụ Jehova.+ Ma, unu na-asị, ‘Olee otú anyị si mee ka ike anyị gwụ ya?’ Ọ bụ maka na unu na-asị, ‘Onye ọ bụla na-eme ihe ọjọọ dị mma n’anya Jehova, ihe onye ahụ na-amasịkwa ya,’+ ma ọ bụ na-asị, ‘Ebee ka Chineke onye na-ekpe ikpe ziri ezi nọ?’”