11 Ma, ọ bụrụ n’eziokwu na m bụ onye ọjọọ, ọ bụrụkwa na m metere ihe e kwesịrị iji maka ya gbuo m,+ ka e gbuo m. Agaghị m arịọ ka a ghara igbu m. Ma ọ bụrụ na ihe niile ndị a na-ebo m ebubo ha abụghị eziokwu, o nweghị onye kwesịrị inyefe m n’aka ha iji zụrụ ụtọ. Achọrọ m ka Siza kpee ikpe a.”+