16 E si n’aka ya jikọọ ahụ́+ niile ọnụ nke ọma, ihe nke ọ bụla dị n’ahụ́ na-enyekwara ibe ya aka ịrụ ọrụ ya otú ga-abara ahụ́ niile uru. Ọ bụrụ na ihe nke ọ bụla dị n’ahụ́ na-arụ ọrụ ya nke ọma, ahụ́ ga na-eto eto, gbasiekwa ike n’ihi na ihe nke ọ bụla dị n’ahụ́ hụrụ ibe ya n’anya.+