7 Ebe ọ bụ na unu dị m n’obi, ọ dị mma na m na-echere unu niile ụdị ihe a. Unu so m enweta amara Chineke meere m n’ihi na unu nyeere m aka na mkpọrọ a tụrụ m,+ nyekwara m aka n’ịgbachitere ozi ọma nakwa n’ịgbalị iji ihe iwu kwuru kwado izisa ozi ọma.+