18 Ụfọdụ ndị na-eme ka hà dị umeala n’obi, na-efekwa ndị mmụọ ozi. Ma unu ekwela ka ha mee ka unu ghara inweta ụgwọ ọrụ+ a ga-akwụ unu. Naanị ihe ha na-ejidesi aka ike bụ ihe ha ji anya ha hụ. Ha na-ejikwa ihe na-enweghị ihe ọ bụ anya isi n’ihi na uche ha niile dị n’ihe gbasara anụ ahụ́.