12 Amara a na-akụziri anyị ka anyị ghara ịna-akpa àgwà na-adịghị Chineke mma, gharakwa ikwe ka ihe ọjọọ ndị dị n’ụwa na-agụ anyị agụụ.+ Ọ na-akụzikwara anyị ka anyị na-ebi ndụ otú gosiri na anyị na-ele ihe anya otú dị mma, na-eme ezi omume ma na-efe Chineke otú ọ chọrọ n’oge a.+