30 O wee ruo na mgbe ọ hụrụ ọla imi ahụ nakwa ọla aka ahụ nwanne ya nwaanyị gba n’aka,+ mgbe ọ nụkwara ihe Ribeka nwanne ya nwaanyị kwuru, sị: “Lekwa lekwa ihe nwoke ahụ gwara m,” o wee bịakwute nwoke ahụ, ma, lee, ọ nọ n’ebe ahụ, o guzo n’akụkụ kamel ndị ahụ n’isi mmiri ahụ.