26 O wee gaa n’ihu ịsị: “Ọ bụrụ na ị ga-ege nnọọ ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke gị wee mee ihe ziri ezi n’anya ya ma ṅaa ntị n’ezie n’ihe o nyere n’iwu, debekwa ụkpụrụ ya niile,+ agaghị m eme ka otu n’ime ọrịa ndị ahụ m mere ka ha rịa ndị Ijipt+ rịa gị; n’ihi na abụ m Jehova onye na-agwọ gị.”+