9 E mesịa, ụmụ Ruben na ụmụ Gad nakwa ọkara ebo Manase si n’ebe ụmụ Izrel ndị ọzọ nọ pụọ, ya bụ, na Shaịlo, nke dị n’ala Kenan, wee lawa, ka ha wee laa n’ala Gilied,+ n’ala ha nwetara, bụ́ ebe e mere ka ha biri dị ka iwu Jehova nyere site n’ọnụ Mozis si dị.+