10 M ga-akwara ugwu ákwá, kwaakwara ya ákwá arịrị,+ m ga-abụrụ ala ịta ahịhịa ndị dị n’ala ịkpa abụ iru uju; n’ihi na a ga-agbaworị ha ọkụ+ nke na ọ dịghị onye ga-esi na ha gafere, ndị mmadụ agaghịkwa anụ mkpọtụ anụ ụlọ.+ Anụ ufe nke eluigwe ga-efepụ, anụ ọhịa ga-agbakwa ọsọ; ha agaghị anọkwa.+