10 “Ma gị onwe gị, ohu m Jekọb, atụla egwu,” ka Jehova kwuru, “atụkwala ụjọ, Izrel.+ N’ihi na, lee! m ga-azọpụta gị n’ebe dị anya ị nọ, zọpụtakwa ụmụ gị n’ala a dọọrọ ha n’agha laa.+ Jekọb ga-alọta, ọ gaghịkwa enwe nsogbu, ahụ́ ga-erukwa ya ala, ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ọ maa jijiji.”+