9 “Kwuo, sị, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Ọ̀ ga-eme nke ọma?+ Ọ̀ bụ na mmadụ agaghị efopụ mgbọrọgwụ ya+ ma mebie mkpụrụ ya? Ọ̀ bụkwa na alaka ya niile a ka gbajipụrụ agbajipụ agaghị akpọnwụ?+ Ọ ga-akpọnwụ. Ifopụ ya agaghị achọ ogwe aka dị ike ma ọ bụ ìgwè mmadụ.