20 Azụ̀ ndị dị n’oké osimiri na anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa na ihe niile na-akpụ akpụ n’ala na ihe niile a kpọrọ mmadụ, bụ́ ndị nọ n’elu ala, ga-ama jijiji n’ihi m.+ A ga-akwadakwa ugwu niile,+ ụzọ niile dị elu ga-ada, mgbidi niile ga-adarukwa ala.’