3 “Lee! M na-ezite onye ozi m,+ ọ ga-edozikwa ụzọ n’ihu m.+ Na mberede, ezi Onyenwe unu,+ bụ́ onye unu na-achọ, ga-abịa n’ụlọ nsọ Ya,+ ya na onye ozi+ nke ọgbụgba ndụ ahụ,+ onye unu nwere mmasị na ya.+ Lee! Ọ ga-abịa,” ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.+