Ihe E Dere ná Ngwụcha Isiokwu
^ [1] (paragraf nke 4) O nwere ike ịbụ na ụbọchị a na-eme Ememme Pentikọst bụ otu ụbọchị ahụ Chineke nyere Mozis Iwu ya na Saịnaị. (Ọpụpụ 19:1) N’ihi ya, ọ ga-abụ na ụbọchị Jehova si n’aka Mozis mee ka ya na mba Izrel gbaa ọgbụgba ndụ Iwu dabara n’otu ụbọchị ahụ Jehova si n’aka Jizọs mee ka ya na ndị e tere mmanụ gbaa ọgbụgba ndụ ọhụrụ.