Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a E nwere ezi ọdịiche dị n’ibewa ahụ iji gwọọ ọrịa ma ọ bụ ọbụna iji maa mma ile anya na ibewa ahụ ma ọ bụ ibekasị ahụ n’ihi mkpali efu nke ọtụtụ ndị na-eto eto, karịsịa ụmụ agbọghọ nọ n’afọ iri na ụma, na-eme. Ibewa na ibekasị ahụ n’ihi mkpali efu dị otú ahụ na-abụkarị mgbaàmà nke oké nchekasị ma ọ bụ ajọ mmetọ mmetụta uche, bụ́ nke pụrụ ịdị mkpa ka onye ọkachamara nye aka na ya.