Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a N’eziokwu, n’ọnọdụ ụfọdụ dị oké njọ, a pụrụ inwe ezi ihe ndị mere di na nwunye ga-eji kewaa. (1 Ndị Kọrint 7:10, 11) Ọzọkwa, Bible kwadoro ịgba alụkwaghịm n’ihi ịkwa iko. (Matiu 19:9) Ma à ga-agba onye òtù ọlụlụ alụkwaghịm ma ọ bụ na a gaghị agba ya bụ mkpebi onwe onye, ndị ọzọ ekwesịghịkwa ịrụgide onye òtù ọlụlụ nke aka ya dị ọcha ikpebi otu ihe ma ọ bụ ọzọ.—Lee akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, peeji nke 158-161, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.