Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ebe ọ bụ na ụzọ ndị ọnwa na ụwa na-aga na ha dị gburugburu, ókè anyanwụ na ọnwa hà n’ibu, ma a na-ele ha anya, na-adịtụ iche na-adebere n’ebe ha nọ n’ụzọ ndị ha na-aga na ha. Mgbe ọnwa nọ n’akụkụ ụzọ ya nke kasị dịrị anya site n’ụwa, akụkụ kasị gbaa ọchịchịrị nke onyinyo ọnwa nwere ike ọ gaghị erutecha na mbara ụwa. Mgbe nke a mere, ndị nọ n’ụwa na-ekiri ya, bụ́ ndị nọ n’ebe onyinyo ahụ rutere ga-ahụ ka ọnwa kpuchiri etiti anyanwụ, na-eme ka a hụ anyanwụ dị ka mgbaaka na-egbukepụ ìhè, bụ́ nke dị gburugburu onyinyo gbara ọchịchịrị.