Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Dị ka akwụkwọ ọgụgụ bụ́ Modern Blood Banking and Transfusion Practices nke Dr. Denise M. Harmening dere si kwuo, “mbibi mkpụrụ ndụ ọbara uhie bụ́ nke na-adịghị ewere ọnọdụ ozugbo” pụrụ iwere ọnọdụ n’ahụ́ “onye ọrịa nke ahụ́ ya na-adịghịzi anabata ihe, bụ́ nke mmịnye ọbara, afọ ime, ma ọ bụ ojiji e ji akụkụ ahụ́ onye ọzọ dochie nke ya, kpatara.” N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, “usoro bụ́ ịgba e ji eme ihe tupu a mịnye mmadụ ọbara adịghị achọpụta” ihe ndị ahụ na-alụso ọrịa ọgụ bụ́ ndị na-eme ka onye ọrịa nwewe nsogbu ma a mịnye ya ọbara. Dị ka akwụkwọ bụ́ Dailey’s Notes on Blood si kwuo, mbibi mkpụrụ ndụ ọbara uhie “pụrụ iwere ọnọdụ ọbụna mgbe ọbara . . . ọjọọ a mịnyere mmadụ na-ebughị ibu. Mgbe akụrụ kwụsịrị ịrụ ọrụ nke ọma, ọ na-eji nke nta nke nta akpatara onye ahụ ọrịa n’ihi na akụrụ ya agaghịzi enwe ike iwepụ ihe ndị na-adịghị mma bụ́ ndị dị n’ọbara ya.”