Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ọ bụghị nanị mmiri ọgwụ ahụ́ bụ́ hormone nke na-akpata nrụgide pụrụ imetụta nwa e bu n’afọ n’ụzọ dị njọ kamakwa, nicotine, mmanya na-aba n’anya, na ọgwụ ndị ọzọ na-emetụtakwa ya. Ụmụ nwanyị dị ime kwesịrị izere ihe ọ bụla dị ize ndụ. Tụkwasị na nke ahụ, ọ dị oké mkpa ịjụ dọkịta banyere mmetụta ọgwụ ị na-aṅụ ga-enwe n’ahụ́ nwa i bu n’afọ.