Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
c Ndị ọkà mmụta na-arụrịta ụka n’etiti onwe ha banyere ebe e si nweta aha a. N’asụsụ Hibru, Mozis pụtara “Onye A Gụpụtara; Onye A Zọpụtara ná Mmiri.” Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Flavius Josephus na-ekwu na ihe mejupụtara okwu ahụ bụ́ Mozis bụ okwu Ijipt abụọ ndị pụtara “mmiri” na “zọpụta.” Taa, ụfọdụ ndị ọkà mmụta kwekwaara na aha ahụ bụ́ Mozis bụ aha ndị Ijipt ma chee na o yikarịrị ka ọ̀ pụtara “Nwa Nwoke.” Otú ọ dị, arụmụka a dabeere n’otú ụda nke okwu ahụ bụ́ “Mozis” si yie ụda nke aha ụfọdụ nke ndị Ijipt. Ebe ọ bụ na ọ dịghị onye maara n’ezie otú e si akpọpụta okwu Hibru ma ọ bụ okwu Ijipt n’oge ochie, ihe ndị ahụ ha na-ekwu bụ ịkọ nkọ.