Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
c Ịchọtara mmadụ di ma ọ bụ nwunye adịchaghị eme ka a ghara inwe alụmdi na nwunye obi ụtọ. Di ka ihe atụ, n’oge Bible, Aịzik na Ribeka banyere n’ụdị alụmdi na nwunye a, n’agbanyeghị nke ahụ, Aịzik bịara “hụ ya n’anya.” (Jenesis 24:67) Gịnị ka anyị na-amụta na nke a? Adịla ngwa ileghara omenala obodo anya ma ọ bụrụhaala na o megideghị iwu Chineke.—Ọrụ 5:29.