Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Merengue bụ ụdị egwú a na-agba agba. Mgbe egwú a pụtara ọhụrụ, ndị na-akụ ya anaghị adị ọtụtụ. Ha na-eji ngwá egwú a na-akpọ accordion, guiro (ụbọ akwara), na tambora (obere ịgbà nwere isi abụọ) akụ ya. Ka oge na-aga, ìgwè ndị egwú dịtụ ọtụtụ (bụ́kwa ndị a maara na Dominican Republic dị ka orquestas) pụtara. Ka ọ dị ugbu a, ọtụtụ ìgwè ndị na-akụ egwú merengue na-eji piano, opi ike, opi nkịtị, na ịgba, tinyekwara ngwá egwú ndị ọzọ akụ ya.