Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
c N’ebe ụfọdụ a na-anọ akparịta ụka n’Intanet, bụ́ ndị e kwuru na ọ bụ maka ndị okenye, a dịghị ekwe ka ndị na-erubeghị afọ ndụ ụfọdụ gaa na ya. Nke a na-abụkarị n’ihi na ihe ndị a na-akparịta na ha nakwa foto ndị a na-egosi na ha na-abụ ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. Otú ọ dị, nnyocha ndị e mere na-egosi na ụmụaka ndị dị ọbụna afọ itoolu na-agha ụgha banyere afọ ndụ ha iji nwee ike ịbanye n’ebe ndị a e mere maka ndị okenye.