Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a N’ekpere nlereanya Jizọs, o kwughị, sị: “Ya mere, kpeenụ ekpere a,” bụ́ nke na-agaraghị ekwekọ n’ihe ọ ka kwupụrụ. Kama nke ahụ, ọ sịrị: “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a.” (Matiu 6:9-13) Gịnị ka ọ chọrọ ịkụziri anyị? Dị ka ekpere nlereanya ahụ na-egosi, anyị kwesịrị ibute ihe ndị gbasara ofufe anyị na-efe Chineke ụzọ kama ibute mkpa anụ ahụ́ anyị ụzọ.