Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ọ bụghị Ndịàmà Jehova chepụtara aha ahụ bụ́ “Jehova.” Ọtụtụ narị afọ gara aga, e nwere ọtụtụ asụsụ ndị na-abụghị ndị e ji dee Baịbụl ndị sụpere aha Chineke ka ọ bụrụ “Jehova,” asụsụ Bekee na Jaman sokwa na ha. Ọ dị mwute na ụfọdụ ndị na-asụgharị Baịbụl ndị e nwere ugbu a ewepụla aha Chineke na Baịbụl ha ma were utu aha ndị dị ka “Chineke” na “Onyenwe anyị” dochie ya. Ihe a ha mere na-egosi na ha anaghị akwanyere Onye chepụtara ihe e dere na Baịbụl ùgwù.