Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
c E nwere mgbe i kwesịrị ịkọrọ onye ọzọ ihe enyi gị gwara gị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na enyi gị gwara gị ezigbote ihe ọjọọ o mere, ma ọ bụ gwa gị na ya chọrọ igbu onwe ya, i kwesịghị imechi ọnụ. Ya bụrụkwa na enyi gị na-eme ihe ị ma na o nwere ike igbu ya, i kwesịghị ịgbachi nkịtị. Ị chọọ ịghọtakwu gbasara ihe a anyị kwuru, gụọ Teta! January–March 2009, peeji nke 19-21, na July–September 2008, peeji nke 16-19.