Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a O nwere ike ịdị mma ka onye ọ bụla ahụ́ ya na-anaghị anabata nri ụfọdụ jiri ọgwụ ọ ga-aṅụ, a naghị ama ama ya erie nri na-adịghị ya mma n’ahụ́. Ndị dọkịta ụfọdụ na-atụrụ ndị nne na nna aro ka ụmụ ha na-eji ma ọ bụ na-eyi ihe ọ ga-abụ onye nkụzi ha ma ọ bụ onye na-elekọta ha hụ, ya amata na e nwere nri ndị na-anaghị adị nwa ahụ mma n’ahụ́.