Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ihe ndị ọzọ na-enyere nwa ahụhụ a aka bụ protin ụfọdụ dị ya n’ahụ́. Protin ndị a anaghị agbaze ngwa ngwa ma anwụ chasie ha ike. Ụkwụ ogologo nwa ahụhụ a nwere na-ebuli ya elu ka ọ ghara ịkpụ afọ n’ala na-ekpo ọkụ, na-enyekwara ya aka ịgbasi ọsọ ike. Nwa ahụhụ a na-enwekwa ike ịmata ụzọ. Nke a na-eme ka o nwee ike ịmata ụzọ kacha mkpụmkpụ ọ ga-esi agbaba n’ọnụ ya.