Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
c Ndị na-enye nkọwa ihe na-eme eme ekwuwo na ịhụ mba n’anya bụ, n’ezie, okpukpe. N’ihi nke a, ndị na-ahụ mba ha n’anya na-efe akụkụ anụ ọhịa ahụ nke mba ha nọ n’ime ya nọchitere anya ya. Banyere ịhụ mba n’anya na United States, anyị na-agụ, sị: “Ịhụ mba n’anya, ọ bụrụ na e lee ya anya dị ka okpukpe, nwere ọtụtụ ihe ndị yiri ibe ha ya na okpukpe ndị ọzọ bụ isi nke oge ochie . . . Onye na-ahụ mba ya n’anya dị ka okpukpe n’oge a maara na ya dabeere na chi nke mba ya. Ọ dị ya mkpa ịnata enyemaka Ya dị ike. N’ebe Ọ nọ ka ọ na-ahụta isi iyi nke izu okè na obi ụtọ ya. Ọ na-edo onwe ya n’okpuru Ya, n’ikwu ya nnọọ n’echiche nke okpukpe. . . . A na-aghọta mba ahụ dị ka nke na-adị ruo mgbe ebighị ebi, ihe ọnwụ nke ụmụ ya kwesịrị ntụkwasị obi na-eme bụkwa nanị ịtụkwasị ihe n’otuto na ịdị ebube ya nke na-adịghị anwụ anwụ.”—Carlton J. F. Hayes, dị ka e hotara ya na peji 359 nke akwụkwọ bụ What Americans Believe and How They Worship, nke J. Paul Williams dere.