Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Banyere ụmụ sitere n’alụmdi na nwunye ndị na-anọghị n’otu okpukpe, Steven Carr Reuben, Ph.D., n’akwụkwọ ya bụ́ Raising Jewish Children in a Contemporary World na-ekwu, sị: “Ụmụaka na-enwe mgbagwoju anya mgbe ndị nne na nna na-ebi ndụ ngọnarị, mgbagwoju anya, ime ihe nzuzo, na izere okwu ndị metụtara okpukpe. Mgbe ndị nne na nna na-adịghị ezo ọnụ, na-ekwu eziokwu, na-edo anya banyere ihe ndị ha kwere, ihe ndị ha ji kpọrọ ihe, na usoro dị iche iche nke ememe ha, ụmụaka na-etolite na-enwe ụdị ịnọ ná ntụkwasị obi na echiche nke uru onwe onye n’okwu okpukpe nke dị mkpa nke ukwuu ná ntolite nke ùgwù onwe onye ha dum na ịmata ọnọdụ ha n’ụwa.”