Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b Dị ka ihe atụ, Bible na-ekwu banyere ihu Chineke, anya ya, ntị ya, imi ya, ọnụ ya, ogwe aka ya, na ụkwụ ya. (Abụ Ọma 18:15; 27:8; 44:3; Aịsaịa 60:13; Matiu 4:4; 1 Pita 3:12) E kwesịghị ịghọta okwu ihe atụ ndị dị otú ahụ n’ụzọ nkịtị, dịkwa ka a na-agaghị aghọta aka ndị e zoro n’ebe Jehova nọ dị ka “Oké nkume ahụ” ma ọ bụ “ọta” n’ụzọ nkịtị.—Deuterọnọmi 32:4; Abụ Ọma 84:11.