Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b Ụfọdụ na-eche na ndị mgbe ochie ndị dịrị ndụ n’oge Bible aghaghị ijiwo ụdị teliskop mgbe ochie mee ihe. Ha na-eche, sị, olee ụzọ ọzọ ndị biri ndụ n’oge ahụ siworị mara na e nwere ọnụ ọgụgụ buru nnọọ ibu nke kpakpando, nke a na-apụghị ịgụta ọnụ, n’otú mmadụ si ele ihe anya? Echiche dị otú ahụ na-enweghị ebe ọ gbakwasịrị ụkwụ adịghị egosi na ha na-echeta na Jehova, bụ́ Onye Chepụtara Bible, nọ.—2 Timoti 3:16.